MMA

Food and Nutrition: Nri ndị ị kwesịrị iri kwa ụbọchị iji kwụrụ chịm

www.bbc.com

  • Chimamaka Ihenacho
  • Broadcast Journalist, Igbo

Ka ị na-eri nri kwa ụbọchị, ị ma na e nwere nri ndị dị mkpa ka i na-eri kwa ụbọchị ka ị nwee ike na-anọ n’ezigbo ahụike?

Nri ndị a dị mkpa n’imezi ahụ mmadụ site n’ime ahụ pụta n’ezi, mana ọtụtụ ndị amaghị n’ihi na ha na-eri nri naanị ka ha wee dị ndụ karịa iri nri maka ndozi ahụ na ezi ahụike.

Ọtụtụ n’ime ha bụ ngwanri ndị ị ma nakwa na-ahụ oge niile, mana ị maghị etu ị ga-esi tikọta ya wee rie ya ka ọ rụọ gị ọrụ n’ahụ.

Nri ndị a na-enye ihe dị iche iche n’ahụ gụnyere Vaịtamin, abụba na mmanụ, mgbadoume, mịneralụ, odozi ahụ nakwa ihe ndị ọzọ dị iche iche.

E nwere ụzọ nri ise mmadụ kwesịrị ịgbado anya ma ọ na-eri nri kwa ụbọchị:

Ndị ọkachamara n’ihe gbasara nri na ihe ọ na-enye n’ahụ ekwuola na mkpụrụosisi dị mma n’ahụ maka ụdịrị ọrụ ọ na-arụ.

Mkpụrụosisi nwere ihe Bekee na-akpọ ‘fiber’ nke na-enyere aka ịgbari nri n’ahụ ma mee ka nri nwee ike igazu gburugburu ahụ mmadụ.

Ha nwekwara shuga nke ha, nke bụ na ọ bụrụ na ị na-asọ shuga, ị nwereike itinye mkpụrụosisi na nri gị were ya mere shuga ị ga-eji rifee nri gị.

Ma o kweghi gị aracha maọbụ ata, ị nwereike ịkwọ mkpụrụosisi gị akwọ ṅụfee ya ka mmiri.

Mkpụrụosisi gụnyere unere, oroma, akị, ube, mangoro, oroma nkịrịsị, icheku wdgz.

Nke a bụ otu ụzọ nri i nwereike iji rijuo afọ ma na-erighi oke nri.

Ndị Igbo nwere ọtụtụ akwụkwọ nri dị iche iche nke a na-eji esi ofe nakwa nri ndị ọzọ.

Mana ị ma na ọ bụghị oge niile ka ị kwesịrị isi akwụkwọ nri gị n’ọkụ?

Ụfọdụ akwụkwọ nri na-adị mma ka o ghara ide ede, ka ihe ndị ọ na-eji edozi ahụ nke Bekee kpọrọ ‘nutrients’ nwee ike ka ju n’ime ya mgbe mmadụ na-eri ya.

Akwụkwọ nri gụnyere ụgụ, ụzịza, onugbu, ọkazị, ụtazị, tomanto, ndukwu, karọt, wdgz

Ero, ọka nakwa ụfọdụ agwa bụkwa ụdịrị akwụkwọ nri.

Nke a so n’ụdịrị nri kacha mkpa ka mmadụ na-eri kwa ụbọchị.

Ọ dị mma iri maka ndozi akwara nakwa ngagharị ihe dị n’ime ahụ; ọ na-enyekwa aka ime ka mmadụ rijuo afọ.

Odozi ahụ gụnyere mmiri ara ehi, ụdịrị azụ dị iche iche, nshịkọ, ịsha, anụ dị iche iche, akwa, nakwa mkpụrụ gụnyere kashu, ahụekere wdgz.

Nkọwa foto,

Ihe ọṅụṅụ eji Soya mee na a dị mma n’ahụ

Mgbadoume nke Bekee kpọrọ ‘carbohydrate’ abụchaghị ihe ọjọọ dịka ụfọdụ ndị na-ekwukarị.

Ụfọdụ na-enye aka n’idozi ahụ, ọkachasị ndị nke nwere ‘fiber’ ahụ, n’ihi na ha na-ejide gị ka mgbadoume, mee ka agụụ ghara ịgụ gị ọsịsọ.

Ụfọdụ mkpụrụ dị mma iri gụnyere achịcha e ji nke Bekee kpọrọ ‘whole wheat’ mee, osikapa na-acha aja aja, ‘oat’, ‘whole-wheat pasta’, quinoa, soyabean wdgz.

5) Nri si na mmiri ara ehi:

A na-esi na mmiri ara ehi emepụta ihe dị iche iche na-edozi ahụ.

Ụfọdụ na-abịa dịka abụba ebe ndị nke ọzọ na-abịa dịka odozi ahụ; nke na-eme ka afọ ju gị mgbe i richara nri, kama e kwesịghị iribiga ya oke.

Nri ndị si na mmiri ara ehi gụnyere yogọtụ, chiiz, bọta wdgz.

Na nchịkọta, nri mmadụ na-eri kwa ụbọchị kwesịrị ịgụnye ọbụlagodi otu ihe n’ime ụzọ nri ise ndị a (ya bụ họrọ otu ihe otu ihe n’ime ụzọ nri ise a jiri mejuputa nri gị kwa ụbọchị).

Irikọta ha ọnụ kwa ụbọchị ga-enye aka ibelata ụjọ ọrịa obi, site n’ime ka mmadụ ghara inwe ọbara mgbalielu nakwa nnukwu kọlesterọl, dịka ngalaba NHS nke mba Briten si kwuo.

www.bbc.com

Show More

Related Articles

Back to top button